FeaturedIgbo News

Gọvanọ Okezie enyela iwu ka anwụchie soja gburu mmadu n’Aba

Views

Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abia Steeti na Tọzde kwuru na anwụchiela onye soja gburu onye ọkada n’Aba.

Nwoke a egburu bụ Mz. Chimaobi Uzoukwa, onye e kwuru na a gbagburu n’ihi na o kweghi enye otu nari naira, ego aka azụ mgbe o rutere n’Ohanze, ebe nyocha ndi soja.

Dịka onye odee akwụkwọ nke Gọvanọ Okezie, Mz. Onyebuchi Ememanka kwuru, Gọvanọ nyere iwu a mgbe ọ gara leta ezinaụlọ ọnwụ a metụtara n’Umuokereke Ngwa nke dị n’Obingwa LGA nke Abia Steeti.

Gọvanọ kwuru na ọ ga-eme ihe niile dị n’aka ya ịhụ na nwoke a nwụrụnụ nwetara ikpe ziri ezi maka ihe a merenu. O kwere ezinaụlọ nwokorobia nkwa na ha agaghị ata ahụhụ ọzọ. Ọ rịọkwara ndi obodo ahụ na ndi na-eme ngaghari iwe ka ha wetuo obi.

Leave a Reply