Igbo News

Gọvanọ ndi South East na Buhari enwela nzukọ maka ọdịmma South East

Views

Ndi gọvanọ nke mpaghara ọwụwa anyanwu akpọkuola Gọọmenti etiti maka iwepụta ego a ga-eji dozie Akanu Ibiam International Airport, nke dị n’Enugu.

Onyeisi oche South East Governors’ Forum, Mz. Dave Ụmahị, onye bụkwa Gọvanọ Ebonyi Steeti, gwara Onyeisi ala Muhammadu Buhari maka ebumnuche ha, n’Abuja, n’ụbọchị Tọzde.

O kwuru na ekwesiri imezicha ọdụ ụgbọelu a, tụpụ e ruo oge ekeresimesi, ka o nwee ike inyere ndi ga-eme njem aka.

Ndi gọvanọ South East gwakwara Gọọmenti Etiti ka o mee ngwa ngwa dozie ụzọ niile dị n’Owerri, ebe e si aga ọdụ ụgbọelu nke dị n’Owerri; ebe ọ bụ ya ka ndi mmamdu ga-eji eme njem ma ọ bụrụ na nke Enugu arụghị ọrụ.

Ụmahị gwakwara Buhari na ha emechiela ndi ọchị ehi ịbata na steeti ha n’ihi na ha chọpụtara na ndi ọchị ehi abụghị ndi Naijiria. O kwuru na ha anaghị asụ Hausa nke ha jị asụ Fulani.

N’otu aka ahụ, Umahi katọrọ ndi IPOB maka igbochi njem ndi Gọvanọ South East na ndi ọchịchị ndi ọzọ. Ọ kwara ha emo, ma kwuo na mgbe ọ ga-aga mba ofesi, na ọ ga-eme ka ndi IPOB mara.

Leave a Reply