FeaturedIgbo News

Gọv. Sule aṅụọla iyi imechi ndị arịrịọ na steeti ya

Views

Gọvanọ nke Nassarawa steeti, Abdullahi Sule, aṅụọla iyi ikpochapụ ndị na-arịọ arịrịọ n’ụzọ na Nassarawa steeti ma dọọ ndị nne na nna na-ezipụ ụmụ ha arịrịọ n’aha Almajiri, aka na ntị ka ha kwụsị ime otu a ma ọ bụ chee ntaramahụhụ dịrị ha ihu.

Gọv. Sule kwuru ịrịọ arịrịọ n’ụzọ bụ ohi, tinyekwara na e kwesiri ikpuchite ikike ụmụaka nke machiri ịrịọ arịrịọ n’ụzọ.

Sule kwuru nke a n’izu ụka a n’emume ndị NTA nke gbasara usoro agụmakwụkwọ Almajiri. O kwuru na ndị mmadu aghọtaghị ihe Almajiri pụtara. O kwuru na ịrịọ arịrịọ esoghi n’atụmatụ Almajiri system of Islamic education.

Leave a Reply