FeaturedIgbo News

Gọọmentị Sierra Leone azụọ Innoson Ụgbọala $4.7m ka Gọọmentị Naịjiria jụchara ịzụ ụlọọrụ Innoson Ụgbọala

Views

Onyeisi ụlọọrụ Innoson Vehicles Manufacturing, IVM bụ Innocent Chukwuma emeela ka a mara na ndị Sierra Leone eziterela ya ozi izụ ụgbọala ruru nde dollar anọ na na puku narị asaa ka ndi ụlọ omeiwu Naịjiria jụchara ịtụnyere ya. O kwuru nke a n’ajụjụ ọnụ ya na ndị Vanguard mere.

Cheta na otu onye Omeiwu gwara ndị ụlọ omeiwu ka a zụọ ndị ụlọọrụ IVM ụgbọala a ga-ebunye ndị omeiwu, mana ọtụtụ ndị omeiwu jụwara ntị.

N’okwu nke Onyeisi ụlọọrụ IVM(Innoson) bụ Innocent Chukwuma: ‘ A natala m ozi ibute ụgbọala ruru nde dollar anọ na puku narị asaa ($4.7m) na Sierra Leone. Ọ bụ ụgbọala ndị Sierra Leone ka anyị na-arụpụta ugbua.

Leave a Reply