FeaturedIgbo News

Gọọmentị Oyo Steeti emebiela ụlọ ahịa ise n’Oyo

Views

Gọọmenti nke Oyo Steeti na Tọzde, emechiele ụlọọrụ na-ere mmanụ ụgbọala maka na ha mebiri iwu nke  burugburu steeti ahụ.  Ndi Daily Post kwuru na e mechikwara ụlọ ahịa na ebe a na-ezu ike karịrị ise mgbe ndi ọrụ gọọmenti na-arụ ọrụ ha.

E mechiri ụlọ ọrụ na-ere mmanụ maka na ha edobeghi iwu nke gbasara gburugburu steeti nakwa adighi eme nzacha na mkocha dịka h kwesiri ime. Ndi ọrụ gọụmentị kwuru na ụdị unyi ebe ahụ ruru na-etinye ndi mmadu n’ọnọdụ ibute ọrịa.

Onye ntuziaka Engineering and Beautification, Ministry nke Water Resources, Moshood Adeola kwuru na ụlọ ahịa ndi emebiri bụ ndi na-erubeghi isi mgbe a gwara ha ka ha hapụ ebe ha na-ere ahịa, n’ihi na ọ nọchịrị ụzọ. E nyere ha iwu a kemgbe ihe karịrị ọnwa isii ma ha emegharighi ahụ.

O kwuru na gọọmentị Oyo Steeti na-agba mbo ịhụ na-edosara ebe niile ọcha. Ya mere, onye ọ bụla na-emebi iwu gbasara gburugburu ebe ha bi kwụsi ya, tụpụ iwe gọọmenti adakwasị ya.

Leave a Reply