Igbo News

Gọọmentị Ogun Steeti ebidola inye ndi ntorobia ọrụ

Views

Gọọmentị Ogun Steeti ebidola inye ndi ntorobia ọrụ. Nke a malitere na Tọzde, iri na ise nke ọnwa Ọgọstụ.

Gọvanọ Dapo Abiodun mepere emume a na Cultural Centre, nke dị na Kuto, Abeokuta. O kwuru na nke a bụ ụzọ o ji emezu nkwa o kwere ha; nke gbadoro ụkwụ na inye ndi mmadu ọrụ.

Site n’igwe ịntanetị, ndi na e nweghi ọrụ ma ndi na-enweghi ọrụ ga-edeba aha ha maka ọrụ na ọzụzụ dị iche iche.

O chetakwara otu ndi mmadu siri nwụfuo ebe ha na-achọ ọrụ Immigration n’2014 nakwa otu mmadu karịrị puku nari ise siri denye aha maka ọrụ Custom Service, ebe a chọrọ naanị mmadu puku abụọ.

O kwuru na ikeputa ọrụ ga-enyere ọtụtụ mmadu aka.

Leave a Reply