FeaturedIgbo News

Gọọmentị Ogun anaa ndị na-achọ ọrụ ego iji nye ha ọrụ

Views

Gọọmentị Ogun Steeti ekwuola na ndị ọ bụla na-achọ ọrụ dịka onye ozi, onye osi nri na ọrụ ndị ọzọ ọkwa ha dị ala n’Olabisi Onabanjo University Teaching Hospital ga-akwụ puku naira abụọ na nari ise(2, 500).

N’otu aka ahụ, ndị na-achọ ọrụ ọkwa ha gbagoro agbago, ga-akwụ puku naira ise(5000).

Ọtụtụ ndị mmadu na soshal media katọrọ mkpebi a ha mere. Ha kwuru na ndị mmadu agaghị enwetanwu ọrụ ebe ahụ n’ihi ego.

Ṳfọdụ kwuru na nke a bụ ụzọ esi a mara ego n’akpa ndị ntorobịa, ndị ọ na-enweghi ka ọ gha ha. Ha kwuru na atụmatụ a adịghị ma ọlị.

 

 

Leave a Reply