FeaturedIgbo News

Gọọmentị Niger emechiela ụlọ akwụkwọ puku abụọ

Views

Gọọmentị Niger Steeti emechiela ụlọ akwụkwọ nke ndị mmadu nwe, nke karịrị puku abụọ na Suleja LGA nakwa n’akụkụ ndị ọzọ nke steeti a.

Alhaji Abubakar Aliyu, onye odee akwụkwọ nke Ministri nke agụmakwụkwọ na Niger, kwuru nke a na Mọnde mgbe ọ nabatara ndị National Association of Proprietors of Private Schools (NAPPS).

Ndị News Agency of Nigeria (NAN) kwuru na ndị otu a gara ụlọ gọọmentị nke dị na Niger steeti maka emume NAPPS day nke 2019.

Aliyu kwuru na emechiri ụlọ akwụkwọ ndị a maka na ha enweghi ihe niile ha kwesiri inwe maka agụmakwụkwọ.

O kwukwara na ewepụtala otu nke ga na-enyocha ụlọ akwụkwọ ndị a nke ndị mmadu nwegasị, iji hụ na ha nwere ihe niile ha kwesiri inwe maka agụmakwụkwọ.

N’aka nke ọzọ, Sally Bolujoko, onyeisi NAPPS, kwuru na emume ha mere ga-enye ha ohere inyocha nsogbu ndị enwegasịrị n’agụmakwụkwọ ma chọ ụzọ esi egbo mkpa ndị a.

Leave a Reply