FeaturedIgbo News

Gọọmentị Naịjirịa ebelatala ego akwụkwọ njem maka ndị US

Views

Gọọmentị Naịjirịa e meela ka ọhaobodo mata na ha ebelatala ego ndị United States of America Kwesịrị ịkwụ maka akwụkwọ njem Naịjirịa.

Ha mere nke a mgbe ndị US kwuru na Naịjirịa ga-akwụ nnukwu ego maka akwụkwọ njem nke ha.

Ndị US Consulate kọwara na ihe mere ha jiri mee nke a bụ maka na Naịjirịa buliri ego akwụkwọ njem nke ya. Ya mere, ha mere nke a n’ụzọ mmegwara.

Mana, na mmeghachi ahụ, Minista nke Interior na Naijiria, Rauf Aregbesola, ekwuola na Wenezde na-ebelatala ego akwụkwọ njem Naịjirịa.

Ya mere, a gwala onye njikwa Nigeria Immigration Service (NIS), Muhammad Babandede, ka emejupụta mbelata ego ozigbo bido na Tọzde, iri abụọ na itoolu nke Ọgọstụ, 2019.

Leave a Reply