FeaturedIgbo News

Gọọmentị Lagos Steeti emechiela Ahịa Oyingbo

Views

Lagos Waste Management Authority (LAWMA) akwụsịla azụmahịa n’ahịa Oyinbo maka mmebi iwu nke gbasara gburugburu ebe a na-ere ahịa.

Muyiwa Gbadegesin, onye ntụziaka LAWMA, kwuru n’akwụkwọ ozi o nyere na Tọzde, na mmebi iwu a gbasara ịwụsa ahịhịa ebe ọ bụla, ịkpọchi ngwa ahịa ha n’ụzọ nakwa na ha ekweghi ka ndị Private Sector Participation (PSP) rụọra ha ọrụ.

Gbedagesin kwuru na a dọọla ndị aka na ntị otu o kwesiri ma ha gbara isi akwara. Nke mere e jiri e mechi ahịa ahụ.

O kwuru na a ga-emepe ahịa mgbe ọ bụla ndị na-ere ahịa bidoro iso iwu gọọmentị ma kwụsị ịwụsa ahịhịa ebe ọ bụla.

 

Leave a Reply