FeaturedIgbo News

Gọọmentị Lagos Steeti ebidola imebisi ahịa mkpụrụ osisi dị n’Ikosi Ketu

Views

Ahịa mkpụrụ osisi nke dị n’Ikosi Ketu, Lagos, ka e bidoro mmebisi na Fraide n’ihi na a chọrọ ịrụ ahịa ọhụrụ ebe ahụ.

Enyela ndị Ikosi-Isheri LGA ikike ịrụgharị ahịa nke nọ n’ọnọdụ ọjọọ. Ego ewepụtara maka nrụgharị ahịa ruru #2.8bn.

N’elekere iri nke ụtụtụ Fraide, buldoza abụọ, na ndị uwe ojii wuchiri ahịa ma bido mmebisi na mkwasasi.

Ngwa ahịa ndị mmadu mebiri ebe ọ dị ukwuu n’ihi na ndị uwe ojii ekweghi ha bata n’ime ahịa. Ụfọdụ ndị ahịa na-ebe na-agwaghị ha n’oge maka mmebisi ahịa.

Ndị ji ọrụ a n’aka nke ọzọ kwuru na e nyere ndị na-ere ahịa izu atọ na abalị asaa ijii bupu ngwa ahịa ha mana ha emeghi nke a.

 

Leave a Reply