FeaturedIgbo News

Gọọmentị Imo Steeti enyela iwu ka anwụchie Okorocha

Views

Gọọmenti Imo Steeti na Tọzde, enyela iwu ka anwụchie Gọvanọ Imo Steeti gara aga nakwa onye Omeiwu, Rochas Okorocha, maka ebubo ịkụ Mz. Jasper Ndubụakụ, onye ọrụ gọọmentị ihe.

Onye ode akwụkwọ nke Gọọmenti Imo Steeti, Mz. Uche Onyeagụọcha mgbe akụchara Mz. Jasper Ndubụakụ ihe n’ụlọ Okorocha.

Onyeagụọcha kwuru na state enyela iwu ka achọwa Okorocha ma gwakwa ndi Imo Steeti ka ha nwụchie ya mgbe ọ bụla a hụrụ ya na Steeti.

E nwetara onyonyo na Tọzde, ebe ndi mmadu ejidegoro na-akụ Ndubụakụ ihe n’ụlọ Rochas Okorocha nke dị na Spibatt Avenue, Owerri.

Ndi uwe ojii gwara ndi nta akụkọ maka nke a n’Owerri. Ha kwuru na Okorocha kwụrụ ndi mmadu ụgwọ ka ha wakpo Mz. Ndubụakụ, onye bụ onye ndumọdụ Gọv. Ihedịọha na ihe gbasara nchekwa.

Ndi uwe ojii, site n’ọnụ Kọmishọna nke Imo Steeti, Rabiu Ladodo, kwuru na a ga-anwụchi Rochas mgbe ọ bụla a hụrụ. a ga-enyochakwa ya, ka a mara otu mmiri siri gbaa n’opi ụgbọgụrụ.

Leave a Reply