FeaturedIgbo News

Gọọmentị etiti ga-ewekọrọ #280m nke Invictus Obi

Views

Ụlọikpe gọọmentị etiti nke dị na Lagos, enyela iwu ka gọọmentị jide nde puku nari naira iri abụọ na puku iri asatọ (#280m), nke bụ ego ahụrụ n’akaụntụ Invictus Oil and Gas nakwa Invictus Investment Limited.

Obinwanne Okeke, onye a mara dịka Invictus, bụ onye a na-ekpe ikpe na US maka nde dọlla iri na otu ($11m), nke bụ ego o nwetara site na wayo ịntanetị.

Ndị EFCC gwara ụlọikpe a na ụlọọrụ abụọ bụ nke Invictus nwe; Invictus, onye isi ndi wayo ịntanetị. Ha kwukwara na ego ahụrụ n’ụlọakụ nwere ike isi na wayo o gwuru ndi mmadu.

N’ihi nke a, Onye ọkaikpe, Rilwan Aikawa, nyere iwu ka gọọmentị etiti jide ya bụ ego n’obere oge.

Leave a Reply