Igbo News

Gọọmentị Etiti ewepụtala Ụbọchị Wenezdee dika Ụbọchị Ezumike

Views

Gọọmenti etiti ewepụtala Wenezdee bụ ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun 2019 dịka ụbọchị ezumike maka emume ụbọchị nnwere onwe ya bụ National Independence Day na bekee.

Onye mere nkwupụta a bụ Okaiwu Georgina Ekeoma Ehuriah bụ odeakwụkwọ onyeisiala. Ọ kpọkuru ndi Naijiria ka ha chekwaa aja ndi nna ha ochie chụrụ maka ọchịchị onye kwuo uche ya, ọ kachasị ndi tufuru ndu ha ime ka Naijiria bụrụ obodo ọma.

Ehuriah yọrọ ndi Naijiria ka ha tinye aka hụ na ọchịchị ọhụrụ a gara ọfụma maka ọdịmma nke onye ọ bụla ka enwe ike inweta udo, ịdịnotu na mmepe na Niajiria. O jikwa ohere a kelee ndi Naijiria ma kpee ka ha nwee ọṅụ na emume ụbọchị nwere onwe.

Leave a Reply