FeaturedIgbo News

Gọọmenti etiti ewepụta ụbọchị emume diaspora

Views

Gọọmenti etiti ewepụtala ụbọchị nke iri abụọ na ise nke ọnwa Julai n’afọ ọ bụla dika National Diaspora Day, iji cheta enyemaka ndi obodo Naijiria bi na mba ndi ọzọ na-enye n’Naijiria.

Nke a ka ụlọọrụ Nigerians in Diaspora Commission (NIDCOM) kwuru n’Abuja n’ụbọchị Tuzde. Onye nkwuchite ọnụ ụlọọrụ a bụ Abdulrahman Balogun kwuru na ụlọọrụ ha dị njikere ịnabata emume a site na njikọ aka ọnụ ha na ụlọọrụ Nigerians in Diaspora Organisation, the Directorate of Technical Cooperation in Africa na Nigerians in Diaspora Alummi Network.

Emume a bidoro n’afọ a, n’ụbọchị iri abụọ na ise nke ọnwa Julai, ebe ndi ọtụtụ ndị ọchịchị bịara maka mmepe ya bụ emume.

 

Leave a Reply