FeaturedIgbo News

Gọọmenti etiti ekwuola na ha ga-arụ ọba akwụkwọ na Lokoja

Views

Kọmishọna na- ahụ maka agụmakwụkwọ na Kogi Steeti bụ Rosemary Osikoya ekwuola na gọọmenti etiti nwere atụmatụ ịrụ ọba akwụkwọ na Kogi Steeti.

Odoziaku Osikoya kwuru nke a n’emume agụmakwụkwọ na Lokoja ma kwuo na nke a ga-enye aka ịkwalite agụmakwụkwọ nke ụmụakwụkwọ. O kwuru na ihe nleba anya ha mere gosiri na ụmụaka ruru nde iri isii na ise amaghị ka esi agụ akwụkwọ ma ya fọdụ odide. O kwuru na nke a bụ oke mkpa nyere Naijiria.

Dika o kwuru, gọọmenti dị njikere inye ndi nkuzi puku iri na ise ọrụ ka ha nwee ike nye aka igbo mkpa.

Onyeisi ọba akwụkwọ nke Naijiria bụ Ọkz. Lanre Aina kwuru na atụmatụ a bụ ka enwe ike kpọlite agwa ịgụ akwụkwọ n’ebe ụmụaka nọ.

Leave a Reply