FeaturedIgbo News

Gọọmenti Anambra Steeti amachie otu ndi keke

Views

Gọọmenti Anambra Steeti enyela iwu nke na-egbochi otu ndi keke a na-akpọ Tricycle Owners Association of Nigeria (TOAN). Iwu a enyere mabidoro ha ịrụ ọrụ ọ bụla na Steeti a.

Kọmishọna na-ahụ maka njem n’Anambra Steeti bụ Mz. Uchenna Okafor kwuru na mgbochi a bụ ihe kwesiri ka emee maka mkpesa a na-anụ maka nsogbu otu a na-enye n’obodo. O kwuru na onye ọ bụla ahụrụ na-arụ ọrụ n’aha otu a ka a ga-agbapu nti.

Nke a bụ ihe o kwuru:

‘Otu TOAN bụ ihe ọhụrụ n’Anambra Steeti; anyị amaghị ndi ha bụ. Ya mere, o nweghi otu ọ bụla kwesiri ịrụ ọrụ ma ọ bụrụ na gọọmenti amaghị ha’.

O nyere iwu ka otu a na ndi ọzọ dika ha kwụsị ọrụ ozigbo na Steeti ha.

Leave a Reply