Igbo News

Gọọmentị Abia Steeti akwụsị mgbatị ọrụ

Views

Gọvanọ Abia Steeti bụ Dkt. Okezie Victor Ikpeazu enyela ntuziaka banyere ndi ọrụ ọha (Public servants) a gbatịrị ọrụ ha, ka ha si n’ọkwa ha di iche iche rituo. Ntuziaka a o nyere ga-amalite n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Juun, 2019.

Gọvanọ nyere ntuziaka site na nkwupụta onyeisi ọrụ nke steeti bụ Onyi Wamah nyere ndi nta akụkọ n’Ụmụahịa n’ụbọchị Wenezdee. Onyi Wamah mere ka a mara na ndi ọrụ ọha okwu a gbasatara, ga-enyeghachi ihe onwunwe gọọmentị ha ji. Ihe onwunwe ndi a ka ha ga-enye ndi minstiri ma ọ bụ ngalaba ha rụrụ n’okpuru ya.

E mekwara ka ndi isi ngalaba na-ahụ maka ego mara na ụgwọ ọnwa agaghi adịrị ndi agbatịrị ọrụ ha, bido n’ụbọchị iri atọ nke ọnwa Juun, 2019.

Leave a Reply