Igbo News

FRSC ekwuola na ha ga-anwụchị ọgbatumtum na-enweghi Plate number

Views

Ụlọ ọrụ Federal Road Safety Corp (FRSC) ekwuola na ha ga-ebido ijide ndi ọgbatumtum ọ bụla na-enweghi plate number bido n’ụbọchị mbu nke ọnwa Ọgọstụ.

Onye nyere iwu a bụ Boboyemi Oyeyemi onye bụ Corps Marshal ndi FRSC. O kwuru na ọ dị mkpa ichekwa ndu na ihe eji ebi ndu n’obodo site n’ichekwa ụzọ dị iche iche e ji ezu ohi mana na-emekwa mpụ dị iche iche.

Oyeyemi kwuru na ọgbatumtum na ụgbọala ụkwụ atọ nke ọ bụla na-enweghi plate number ka a ga-anwụchị. O kwuru na ha emela plate number nye ụdịrị ụgbọala ọ bụla na-agba n’ụzọ. o gwara ndi na-anya ụgbọala ka ha gadebanye aha ụgbọ ha n’akwụkwọ ụlọ ọrụ ha. Ya mere, ụgbọ ala niile na-agba n’ụzọ kwesiri inwe ihe akpọrọ Vehicle Identification Number.