FeaturedIgbo News

FG na Gọọmentị Russian na-arụkọta ọrụ maka Ụlọọrụ Ajaokuta Steel

Views

Gọọmentị etiti kwuru na ha na Gọọmentị Russian na-arụkọ iji mee ka ụlọọrụ Ajaokuta Steel bido rụwa ọrụ.

Minista nke mines, Mz. Olamilekan Adegbite, kwuru nke a na mkparịta ụka ya na otu ndị omeiwu na-ahụ maka Solid Minerals, Mines, Steel Development na Metallurgy nwere n’Abuja, na Fraide.

O kwuru na ihe mere Onyeisi ala Muhammadu Buhari ji a ga Russia bụ ka ha na ya kpa, mara ka a ga-esi bido ọrụ n’ụlọọrụ a na-ahụ maka igwe.

Minista a kwuru na ndị Russia egosila mmasị ha inyere Naijiria aka site n’iji ego nke ha mee ka Ajaokuta rụwa ọrụ. O kwuru na ha ga-eji ego ha mezie ebe fọdụrụnụ, rụọ ọrụ ebe ahụ nwa obere oge ma nweta ego ha tinyere tụpụ enyeghachi ya ndi Naijiria.

O kwuru na nke a bụ ụzọ kacha mma a ga-esi mme ka ụlọọrụ Ajaokuta steel rụwa ọrụ ọzọ.

 

Leave a Reply