FeaturedIgbo News

FG ewekọrọ akụnaụba E-Money niile

Views

Ụlọ ikpe nke gọọmentị etiti, nke dị n’Owerri, enyela iwu nke nyere gọọmentị etiti ikike iwere ihe enwe enwe niile nke onye ntọrọ aha ya bụ Collins Ezenwa nwe.

Collin Ezenwa, onye a na-akpọ E-Money, bụ onye ndi uwe ojii gbagburu mgbe ha na-agbakọrịta onwe ha egbe na Januari, 2018.

Ụlọ ikpe a nyekwara iwu ka onye ọ bụla nwere mmasị n’ihe enwe enwe nke Collins, pụta, site ugbu a ruo ụbọchị iri atọ n’abịanụ, iji kwuo ihe mere gọọmentị agaghị ewekọta ihe ndi a.

A chọpụtara na E-Money nwere ụlọ iri na atọ, ụgbọala iri, nnukwu ụgbọala abụọ, na AK-47 atọ.

Leave a Reply