FeaturedIgbo News

A ga-ebepụ ego n’ego a na-akwụ ndị ọchịchị- Ngige

Views

Minista nke ọrụ, Chris Ngige, ekwuola na ha nwere atụmatụ ileba anya n’ụgwọ a na-akwụ ndị ọchịchị n’obodo a.

Ngige gwara ndị otu Nigerian Union of Local Government Employees (NULGE) nke a mgbe ha bịakwutere ha n’ụlọọrụ n’Abuja, na Tuzde.

O kwuru na ọ dị mkpa ileba anya n’ego ndị ọchịchị na ndị ọrụ gọọmentị na-enweta n’ụlọọrụ gọọmentị. O kwuru na gọọmentị ewepụtala otu ga-enyocha ụgwọ, nke Minista na-ahụ maka ego bụ Onyeisi oche ha.

Na mmeghachi ahụ, onyeisi NULGE, Ibrahim Khaleel, kwuputara mkpa ọ dị na otu ha ga-esonye na otu ndị na-ahụ maka minimum wage.

O kwukwara na ọ bụrụ na gọọmentị achọghị otu ha, na a ga-ekepụta otu ọzọ maka ndị na-arụ n’ime obodo.

Ha rịọrọ gọọmentị etiti ka o tinye ọnụ n’okwu a.

Leave a Reply