FeaturedIgbo News

FG ewepụtala #9bn maka jeneratọ

Views

Gọọmentị etiti nwere atụmatụ imefu ijeri naira itolu maka ọzụzụ, mmezi jeneratọ na ịzụ mmanụ ọkụ maka ya bụ jeneratọ n’ụlọọrụ gọọmentị niile dị na Naijiria.

Gọọmentị wepụtakwara nde naira iri asaa na ise ọzọ maka mmezi na ịzụ mmanụ maka jeneratọ ndị nọ n’ụlọọrụ Naijiria ndị dị na mba ofesi.

Nkọwa ihe ndị a dị n’akwụkwọ mmefu ego nke Onyeisi ala Muhammadu Buhari nyere ndị ụlọ omeiwu na Tuzde.

E kwuru na ego a ga-emefu n’ihe gbasara jeneratọ ga-akarị ihe edere n’akwụkwọ n’ihi na ụfọdụ ụlọọrụ dịka Independent National Electoral Commission na National Health Insurance Scheme, ndị nwegasịrị ụlọọrụ n’ebe dị iche iche na Naijiria, eweputaghi akwụkwọ mmefu ego.

Gọọmentị etiti wepụtara ego niile maka jeneratọ n’agbanyeghi na e kwuru na a ga-emeziwanye otu esi eweta ọkụ.

Leave a Reply