FeaturedIgbo News

FG enyela mkpesa maka ụdị mmekọahụ a na-enwe na BBN

Views

Gọọmentị etiti n’ụbọchị Fraịde, nyere ndị National Broadcasting Commission mkpesa gbasara otu esi enwe mmekọahụ na emume BBN.

Gọọmentị ekwuola na ya na ndị Startimes enweela mkpebi maka ụzọ a ga-esi gbanwee emume BBN ka o nwee ike igosipụta otu ndị Naịjirịa si ebi ndụ, nri Naịjiria na ụdị akwa ndị Naịjirịa na-eyi.

Onye Ntụziaka National Council for Arts and Culture, Otunba Segun Runsewe kwuru nke a mgbe Onyeisi National Council of Women Societies, Dkt. Gloria Shoda gara leta ya.

Ụdị mmekọahụ a na-ekwu maka ya na BBN bụ nke gbasara Khafilat Kareem na Ekpata Gedoni, ndị so n’emume BBN.

Runsewe kwuru na ihe a na-egosi ọha n’emume BBN abụghị ihe e jiri mara ndị Naịjirịa ma ncha. Ya mere ọ ga-agbadosi ụkwụ n’ala ịhụ na e mere ihe gbasara ya.

O ji ohere a na-agwa ndị Naịjirịa na BBN ọhụrụ na-abịa n’oge na-adịghị anya; ebe a ga-egosi ihe e jiri mara Naịjirịa.

Onyeisi NCWS, Shoda, kwuru na ụdị ihe a na-egosi n’emume BBN na-asọ oyi:

‘Inwe mmekọahụ n’ihe onyonyo na-emebisi ụmụaka, ọ pụtara na ndị mmadụ agaghị ejidenwu onwe ha, na-enweghi mmekoahụ ọ bụla ruo ọnwa atọ?’

Leave a Reply