FeaturedIgbo News

FG amapụta 13bn maka ndị Nche Ime Obodo

Views

Gọọmentị Naịjiria amapụtala ijeri naira iri na atọ (N13bn)maka mmalite ọrụ ndị nche ime obodo a kpọrọ ‘Community Police’ na Naịjiria iji kwalite ezi nchekwa ndụ na akụnaụba.

Gụọ: Ndị Oji Egbe awakpo ụlọ ndị Uweojii, bukọrọ egbe ha

N’ọgbakọ ndị National Executive Council (NEC) nwere ụbọchị Tọọzde, nke Osote Onyeisiala Yemi Osinbajo bụ onyeisioche,ha kwekọrịtara ka onyeisioche ndị Nigerian Governors Forum, gọvanọ abụọ ọzọ, Odeakwụkwọ Naịjira, Minista na-ahụ maka ego nakwazi IG ndị uweojii, hụ ma hazie ka a ga-esi jiri ego ahụ kwado ihe e bu n’obi.

Leave a Reply