FeaturedIgbo News

Femi Otedola enyela ndị SAVE THE CHILDREN FOUNDATION #5bn

Views

Femi Otedola na Sọnde, Nọvemba 10th, nyere ndị ‘Save The Children Foundation’ #5bn, site n’aka nwa ya nwanyị, ‘DJ Cuppy Foundation’ maka ụmụaka nọ na mkpa na Naijiria.

Otedola site n’ọnụ nwa ya nke mbu, Tolani, nyere ego a na Gala Night nke e mere na Transcorp Hilton Hotel, Abuja.

N’otu aka ahụ, Aliko Dangote nyekwara ndị ‘Save The Children Foundation’ ego ruru #100m. Mgbe o  na-ekwe nkwa, Dangote kwuru na Naijiria chọrọ ndị ego nwere aka onyinye ka ha bịa nyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka.

Dangote kwuru na gọọmentị ji ọtụtụ ihe n’aka. Ya mere, a gaghị ahapụ ọnọdụ ụmụaka ka ọ na-abawanye ebe a na-eche gọọmentị.

Leave a Reply