FeaturedIgbo News

FEC ewepụta (#109bn) maka okporo ụzọ awara awara

Views

Otu Federal Executive Council (FEC) nke Osote onyeisi ala, Yemi Osibanjo, bụ onye isi ha, na Wenesde ewepụtala ijeri otu nari naira na itoolu (#109bn) maka ịrụ ụzọ Ibadan-Ilesha-Ife na Kano-Katsina.

NAN kwuru na Minista nke na-ahụ maka ọrụ na ụlọ, Babatunde Fashola, kwuputara nke a mgbe ọ gwara ndi nta akụkọ nke State House mpụtara nzukọ ha nwere.

O kwuru na ijeri naira iri asaa na itolu na nde asatọ (#79.8bn) bụ nke a ga-eji arụ ụzọ Ibadan-Ilesha-Ife nke bụ ụzọ gbara abụọ. Ego nke fọdụrụ ijeri naira iri abụọ na itolu na nde isii (#29.6bn) bụ nke eji arụ ụzọ Kano-Katsina, nke bụkwa ụzọ gbara abụọ.

O kwuru na ụzọ Ibadan-Ilesha-Ife ga-ejikọ Oyo na Osun steeti.

Minista nke Agụmakwụkwọ, Steeti, Mz. Emeka Nwajụba, onye kwukwara maka mpụtara nzukọ a, kwuru na otu a wepụtakwara nde nari naira itolu na iri na ise (#915bn) maka ịrụ Falkọti nke Environment, nke Mahadum Abuja.

E wepụtakwara nde nari naira itolu na iri na asatọ (#918bn) maka ịrụ Falkọti nke Education na otu Mahadum a.

Leave a Reply