FeaturedIgbo News

Fani-Kayode akatọla mwakpo e mere ndị IPOB n’Ebonyi steeti

Views

Femi Fani-Kayode, onye bụbu Minista nke Aviation egosila mmeghachiahụ maka mwakpo ndi uwe ojii wakporo ndị otu Indigeneous People of Biafra n’Ebonyi steeti.

Ṳbọchị ole na ole gara aga, e nwetara mkpesa na ụfọdụ ndị nchekwa obodo wakporo ebe ndị IPOB na-enwe nzukọ ma gbawa ha egbe. Onyeisi ndị IPOB kwuru na ndị otu ha merụrụ ahụ ebe ọ dị ukwuu.

Fani-Kayode katọrọ ụdị mwakpo a. Ọ kọwara mmegbu na ogbugbu dịka ezigbo ihe ọjọọ.

O kwuru site n’igwe Twitter ya na ụdị mmegbu e mere ndị IPOB n’Ebonyi steeti ekwesighi nnabata. Imegbu ndị aka ha dị ọcha ọkachasị ụmụnwanyị na ụmụaka bụ ihe jọkarịsịrị udele na njọ.

 

Leave a Reply