FeaturedIgbo News

Ezubeghi RUGA maka steeti ndị abụghị nke ndị Fulani- Ganduje

Views

Gọvanọ Abdullahi Ganduje nke steeti Kano, ekwuola na steeti ebe enweghị ụmụ amaala Fulani agaghị eso n’ebe aga-ehibe RUGA. Ganduje mere nkọwapụta a mgbe ọ gachara mmemme agbamakwụkwọ nke nwa Sen. Kabiru Gaya, Ibrahim Khalil na Sokoto na Satọde. Gọvanọ ahụ gwara ndị nta akụkọ na ebumnuche ihibe RUGA bụ maka steeti ndị nwere ike ịnabata Fulani, ma na-ezubere ime ka ịchị ehi bụrụ mbọ ga-enye aka  na mmekọrịta akụ na ụba, n’abụghị ihe ga-ebute esomokwu obodo. “Ya mere, agaghi amanye steeti ebe ụmụ amaala na-abụghị ndị Fulani ka ha nabata RUGA dika ọ bụ maka steeti ndị nwere ike inyere ndị Fulanis aka ma chọọ ime ka ịchị ehi ha bawanye. Ọ bụ ya mere anyị ji ehibe RUGA na steeti Kano, ka ndị Fulani wee nwee ike ịnọ n’otu ebe wee nwee ihe nrite ọha na eze dị ka ndị ọzọ si enwe. Ganduje kwuru, “A ga-emezi ụdị ịkpa anụ ụlọ ndị Fulani na-eme ugbu a, ka ha nwee ike wepụta ọtụtụ ehi, mmiri ara ehi ma nwekwaara onwe ha ụba akụ na ụba.” Ndi Fulani: iwe anyi megide Obasanjo, ndi ozo; na-atụ egwu na. Gọvanọ ahụ kwuru na ụzọ kachasị mma iji meziwanye usoro ndụ nke ndị Fulani bụ site n’imachibido ịkwaga ngwongwo ha na mpaghara etiti na ndịda nke Nigeria. “O nweghị ụzọ ka mma ị ga – esi meziwanye ndụ ha ma ọ bụrụ na egbochighị ha ịkwaga ugwu ha na mpaghara etiti na ndịda Nigeria.

Leave a Reply