Igbo News

Esemokwu maka ala eriela isi mmadu n’Anambra

Views

Agadi nwoke gbara afọ iri asaa nke aha ya bụ Anthony Okongwu abụrụla onye nwụrụ anwụ n’ihi esemokwu ala dị n’etiti ndi Ikenga Ogidi na Ụmụsiome Nkpọr n’Idemili local gọọmenti, Anambra Steeti.

Okongwu, onye bụ onye Ikenga Ogidi ka asịrị na ndi Ụmụsiome Nkpọr wakporo mgbe ya na ndi obodo ya na-enyocha ala obodo ha. Mmadu atọ ndi si Ikenga Ogidi bụ ndi merụrụ ahụ na nwakpo a.

Onyeisi otu Ikenga Ogidi bụ Amaechi Ekume boro ụfọdụ ndi Ụmụsiome Nkpọr ebubo dịka ndi aka ha dị n’ihe mere. Ekume kwuru na esemokwu ala a bụ nke ekpeziri n’afọ 2006, nke na ndi Ikenga Ogidi meriri na ya bụ okwu.

Ekume kwuru na ọ bụ ndi Nkpor bu isi nsogbu a. Ọ rịọrọ gọọmentị na ndi uwe ojii ka ha bịa tinye ọnụ n’okwu. Ka nsogbu a ghara iga n’ihu, Ekume kwụsiri ndi ntorobịa ịrụ ọrụ n’ ala ahụ ruo mgbe emeziri okwu.

Onyeisi ndi Ụmụsiome Nkpọr bụ Pius Obiogbolu sịrị na ihe bụ nsogbu bụ ihe gọọmenti dere n’akwụkwọ mgbe o kechara ala ahụ. O kwuru na ọ ga-aka mma ma gọọmenti bịa leba anya na ya bụ okwu.

Leave a Reply