Igbo News

Enwere ike ịmachịbido ngaharị ọzọ maka idebe Lagos ọcha

Views

Ụbọchị atọ ka anabatachara ndi ọchịchị ọhụrụ ka gọvanọ Babajide Sanwo-Olu bụ aka na-achị steeti Lagos na-atụle iweghachi mmachibido emere maka idebe gburugburu ebe obibi ọcha n’ ụbọchị Satọọdee ikpeazụ n’ọnwa.

Etu ọ dị ugbu a, Goomenti Lagos esila na ‘social media’ tulee ka ndi mmadu bi na Lagos siri hụta ụdị mgbanwe a. Site na nchọpụta e nwetere na ‘Facebook’ na ‘Twitter’, ihe karịrị pacenti iri asaa na itolu kwenyere na echiche onye ọchịchị Lagos.

Unyi Lagos ruru ugbu a bụ otu n’ihe kpatara Akinwumi Ambode, onye ọchịchị Lagos gara aga, achịghị Lagos nke ugboro abụọ. Ihe mere Lagos jiri ruo udi unyi o ruru bụ na, Ambode weere ihe banyere ikpofu ahịahịa nye ụlọ ọrụ a na-akpọ ‘Vision Scape’.

Ọzọkwa, ihe mere Ambode jiri kwụsị idebe gburugburu ebe obibi ọcha bụ n’ ihi na ndi Ụlọ ikpe ‘Appeal’ na afọ 2016 machibidoro gọọmentị steeti imachi ngahari ndi mmadu ma emewe emume idebe ebe obibi ọcha, ebe ọ bụ na enweghi iwu machibidoro nke a. Nke a mere na enweghi ike ijide onye ọ bụla nọ n’ụzọ ije ma emewe idebe ebe obibi ọcha.

Ya mere, ụlọ ikpe agwala gọọmentị steeti ka eme iwu machibidoro ngahari tupu amanye ndi mmadu iwu.

Leave a Reply