Igbo News

Emechiela Mahadum Benue Steeti

Views

Mahadum nke Benue State, Makurdi, bụ nke emechigoro; nke amaghị mgb a ga-emepe ya ọzọ.

Ndi njikwa Mahadum a, mgbe ha na-emechi ya na Mọnde kwuru na ha nwere mkpebi a maka mmechi nke ụmụakwụkwọ mechiri ọnụ ụzọ Mahadum a n’ụtụtụ Mọnde.

Otu ọ dị, ndi nta akụkọ amatabeghi ihe mere ụmụakwụkwọ jiri mechie ọnụ ụzọ Mahadum a. Mana ndi njikwa Mahadum nke Benue kwuru na ha mechiri ka mmebi iwu ghara ịga n’ihu na ya bụ Mahadum.

A gwakwara ụmụakwụkwọ ka ha hapụ ụlọakwụkwọ na Mọnday, ụbọchị abụọ nke ọnwa Septemba.

Leave a Reply