Igbo News

Ejizila ndi nchekwa emechi ndi Naijiria ọnụ: Soyinka gwara FG

Views

Ọkankuzi Wole Soyinka agwala Gọọmentị etiti na ndi nchekwa obodo ka ha kwụsị imechi ndi Naijiria ọnụ mgbe ọ bụla ha bịakọtara ọnụ ịkparita ụka.

O kwuru na ụdị agwa na-egosi na ụjọ na-atụ gọọmentị ma na-eweda gọọmenti ahụ n’onwe ya.

Cheta na Monde gara aga, ndi uwe ojii, amị na DSS mechiri ebe Soyinka na Falana kwesiri inwe ọgbakọ; ebe e kwesiri ịnọ kwuo okwu banyere nchekwa obodo.

Soyinka na-akọwa na ụdị emume gosiri na gọọmenti na-atụ ụjọ ige nti n’ihe ha nwere ikwu.

Ọ dọkwara ndi mmadu aka na ntị ka ha kpachapụ anya gbasara ụdị ihe ha na-agụ n’igwe soshal midia, n’ihi na o nweghi eziokwu dị n’akụkọ ụfọdụ a na-ebugharị.

Leave a Reply