Igbo News

Egwu Eke agaghi adaba na ntuliaka Februari 16 – Ohanaeze Ndigbo

Views

Ohanaeze Ndigbo, nke bu otu ogbako jikoro ndi Igbo onu adoola Goomenti etiti nakwa ndi Ami aka na nti ka mmiri zoro na steeti Abia n’ onwa nke itoolu n’afo 2017 bu Egwu Eke nke a kporo PYTHON DANCE ebe e gbufuru imirikiti imi umu afo Igbo ghara izo ozo.
Onyeisi ndi Ami bu Lieutenant General Tukur Buratai nyere ndi Ami niile iwu ubochi Monde, ka ha ghara igbu oge n’igbatu onye obula kwadoro na ntuliaka Satodee na-abia agaghi aga n’udo.
Mana n’okwu onyeisi Ohanaeze, Chief Nnia Nwodo, o mere ka goomenti mata na iwu a enyere ndi Ami ga-egbochi otutu ndi iputa tuo akwukwo n’ala Igbo okacha na nhoputa Onyeisiala.

Leave a Reply