EntertainmentFeatured

Ego m agaghị eme ka mu na Ike nwee nsogbu – Mercy Eke

Views

Onye mmeri na ihe emume Big Brother Naija, Mercy Eke, kwuru na ọyị ya na ike ga na-aga ọfụma n’agbanyeghi ego o nwetara. Mercy na Ike Onyema hụrịtara onwe ha n’anya mgbe ha nọ n’ụlọ emume BBN.

Mercy Eke kwuru na ego o nwere agaghị ebute nsogbu n’ebe ịhụnanya dị. O kwuru na ya na Ike ga-arụkọta ọrụ ọnụ.

Na mparịta ya na ndị Sunday Scoop nwere, o kwuru na ihe mere o jiri hụ ike n’anya bụ maka na Ike bụ nwoke pụrụ iche.

Mercy Eke kwukwara na o gosiri ahụ ya ọfụma mgbe ha nọ n’ụlọ emume BBN maka obi siri ya ike na ahụ ya mara mma. O kwuru na ọ dị mkpa ka nwanyị ọ bụla hụ ahụ ha n’anya.

Leave a Reply