FeaturedIgbo News

EFFC ekwuola okwu maka ebubo #900m eboro ha

Views

Ndị Economic and Financial Crimes Commission, EFCC, ekwuola na ọtụtụ ozi nke edere gbasara ego ha buuru, nke dị n’ime igbe, abụghị eziokwu.

Ha kwuru nke a site n’igwe Twitter, ebe ha mere ka ọhaneze mara na ebubo eboro ha gbasara ego tụgharịrị họrọ akwụkwọ, abụghị ihe mere eme.

Ha kwuru na ndi Central Bank of Nigeria kpesara ha maka ikpe a na 2015. Dịka ha na-eme nyocha, ndi EFCC kwuru na ha gara n’ụlọọrụ CBN nke dị n’Ibadan, inyocha igeb ndị ahụ ego dị n’ime ha, ma chọpụta na ego ahụ adịghịzi ebe ahụ.

Ha kwuru na o nweghi mgbe edosara ego ahụ n’ụlọọrụ EFCC.

Ya mere, ha na-agwa ọhaneze ka ha leghara ozi a anya ma gwakwa ndi nta akụkọ ka ha kpachara anya ha maka ụdị ozi ha na-efesasi.

Leave a Reply