FeaturedIgbo News

EFCC na FBI anwụchiela mmadụ 167 maka iri ọrụ ịntanetị

Views

Njikọ ọnụ ndị Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) na Federal Bureau of Investigation (FBI) jidere ndị Naijiria 167 maka ebubo iri ọrụ intaneti.

E mere ka a mara nke a na nnọkọ nkwukọrịta nke ụlọ ọrụ abụọ a na Lagos na Tuesday.

Dịka onyeisi  Operations ndị EFCC, Mohammed Abba, siri kọwaa, e jidere ndị ahụ ihe dịka otu ọnwa e jiri jikọọ otu abụọ a ọnụ.

O mere ka a mara na ihe a nakọtara ha gụnyere; $ 169,850, nde N92, ụgbọ ala anọ kpụ ọkụ n’ọnụ na, ụlọ ndị dị n’Abuja na Lagos.

Leave a Reply