FeaturedIgbo News

EFCC ga-azụgharị ụmụnwoke ndị na-eme wayo ịntanetị

Views

Onye nnọchite anya onyeisi oche Economic Financial Crimes Commission, Mz. Ibrahim Magu, kwuru na otu ha nwere atụmatụ ịzụgharị ndị ntorobịa, ndị na-egwu ndị mmadu wayo ịntanetị, ndị a mara dịka Yahoo Yahoo.

Magu kwuru nke a na Lagos na Tọzde mgbe ọ na-enye nkuzi nke isiokwu ya bụ, ‘Strategic change administration and innovation to curb corruption in Nigeria’ na nzukọ ndị Chartered Institute of Administration.

O kwuru na ndị wayo ịntanetị ga-abara ụlọọrụ ha uru n’ọdịnihu.

Magu kwuru ndị EFCC na ndị ECOWAS na-arụkọta ọnụ iji ijide ndị na-eme mpụ n’obodo ndị ọzọ. Ya mere, onye ọ bụla buuru ego na Naijiria gawa Ghana, a ga-akpọ ndị otu ha nọ Ghana ka e jide ya bụ onye omekome.

Magu kwuru na ha ga-etinye ndị ọrụ ebe ọ dị ọtụtụ ka iji nye aka belata mpụ n’obodo a.

Ọ rịọrọ ndị CIA ka ha na ha rụkọta ọrụ iji belata mpụ na arụrụ n’ala.

Leave a Reply