Igbo News

Ọnya ndi EFCC amala onye ọcha na-egwu ndi Naijiria wayo

Views

Ụlọ ọrụ Economic and Financial Crime Commision (EFCC) na Tuzde ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa Juun akpọpụla onye obodo Amerika a na-akpọ Marco Ramirez ụlọ ikpe maka ịnapụ ọtụtụ ndi obodo Naijiria ego ruru puku narị dọla ise, puku iri isii na ise(565, 000 dollars)

Mazi Ramirez na ụlọ ọrụ ndi ha na ya so arụ ọrụ ka akpọpụrụ ụlọ ikpe. Ụlọ ọrụ ndi a gunyere: USANOW LLC, Eagle Ford Instalodge Group LP na USANOW Capital Group. Ụlọ ọrụ ndi a ghọgburu ndi mmadu, nara ha ego ma ha enyeghi ha visa.

Nke a abụghị nke mbu Ramirez na-aga ụlọ ikpe. Akpọpụrụ ya ụlọ ikpe n’ụbọchị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Juun, 2017. Ma e jiri puku dọla iri abụọ na ise(25,000 dollars) were gbapụta ya. Ugbu a, akpọpụkwala ụlọ ikpe maka ịnapụ Godson Echejuo, Abubakar Umar na Olukayode Sodimu ego ma kwe ha nkwa itinye ha na ihe a na-akpọ Citizen and Immigration Services Employment na bekee.

Ihe ndi ọzọ eboro ya bụ ịnapụ Ejikeme Mgbemena na Frank Egbon ego ruru nde dọla abụọ na puku nari atọ(2.3m dollars) ma kwe ha nkwa inye ha na ezinaụlọ ha ‘Green Card’ nke obodo Amerika.

Ikpe nwa amadi a ka a ga-ekpe n’ụbọchị asaa, asatọ na itoolu nke ọnwa Ọktoba, 2019.

Leave a Reply