FeaturedIgbo News

EFCC anwụchiela onye na-arụ n’ụlọakụ na nwunye maka wayo $1.49m

Views

Ụlọọrụ EFCC nke dị Lagos, anwụchiela di na nwunye, Rowly Isioro, onye enyemaka Onyeisi otu ụlọakụ na nwunye ya Ovuomarhoni Naomi Isioro, onye na-azụ ahịa, maka ebubo izu ego.

Akwụkwọ ozi nke ndị EFCC nwepụtara na Nọvemba 4th, kwuru na ha zuru ego ruru otu nde dollar na puku iri anọ na itolu nke akwụnyere n’akaụntụ Naomi Isioro.

Ndị EFCC nwụchiri di na nwunye a ka ha natachara akwụkwọ n’aka ndị Federal Bureau of Investigation, FBI, nke kwuru na di na nwunye tinyere aka na wayo ịntanetị na izu ohi.

Leave a Reply