Igbo News

Education ministry: Gọọmentị ga-enye ndi nkuzi ruru eru ọrụ

Views

Onye ode-akwụkwọ ministri nke agụmakwụkwọ bụ Mz. Sonny Echono ekwuola na ndi nkuzi ọ bụla ruru eru ma nwekwa asambodo ka a ga-enye ọrụ. Nke a bụ ka e nwee ike iwepụ ndi nkuzi na-erughi eru nọ n’ọrụ nkuzi.

Echono kwuru nke a mgbe ọ na-enyocha ule ndi nkuzi lere nke a kpọrọ ‘Teachers Qualifying Examination’ na bekee n’Abuja n’ụbọchị Satọọdee bu Juun 8 2019. Ọ sịrị na ihe mbu ha ga-eme bụ ịchịkọta aha ndi nkuzi lere ule ma nwetakwa asambodo ma ha enweghi ọrụ.

Ha kwukwara na a ga-eke ndi nkuzi niile na steeti na steeti wee mee ka steeti ọ bụla nweta ndi nkuzi nke ha. Ya mere, onye ọ bụla na-enweghi asambodo agaghị enwe ike ikuzi nkuzi. Ha kwuru na ndi nkuzi ha ji ụgwọ ọrụ dị ọtụtụ n’ihi nke a, ndi na-erughi eru ka a ga-ewepụ n’agumakwụkwọ.

Nke a ka ekwuru ga-ebido n’ụbọchị nke iri atọ na otu, n’ọnwa Decemba, 2019. Nke a metụtara ndi nkuzi niile; ma ndi nọ n’okpuru gọọmenti ma ndi nọ n’okpuru praiveti.

Leave a Reply