Igbo News

ECOWAS ewepụtala onyeisi oche ọhụrụ

Views

Economic Community of West African State (ECOWAS) ahọpụta onyeisi oche ọhụrụ nke aha bụ Onyeisi ala Issoufou Mahamadou nke obodo Niger. Ọ bụ naanị otu afọ ka ọ ga-achị.

E mere nhọrọ a n’ụbọchị Satọde iri abụọ na itolu nke onwa Juun. Mahamadou na-anọchị anya Muhammadu Buhari bụ onye bụbu onyeisi oche n’afọ gara aga.

Na nzukọ a ha mere, ọ bụ naani ndi isi ala iri na atọ na ndi isi ala iri na ise e nwere bụ ndi biara. Ha gunyere ndi isi ala Benin, Burkina Faso, Cote d’Ivoire, Gambia, Ghana, Guinea, Guinea Bissau, Liberia, Mali, Niger, Nigeria, Sierra Leone na Togo. Ndi ọzọ bụ ndi mmadu nọchiri anya ha.

Ha ga-enwe nzukọ ọzọ n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Decemba.

Leave a Reply