FeaturedIgbo News

ECOWAS Ehibe Otu Ga-Enyocha Mmechi Okeala ndị Naịjirịa Kemgbe Ọgọstụ 2019

Views

Otu Economic Community of West African States eguzobela otu maka inyocha ọdịmma na ọghọm dị na mmechi gọọmentị Naịjiria mechiri agbata okeala niile gbara Naịjiria okirikiri. E guzobere otu a ma nye ha iwu iwechighata nchọpụta ha ka a mara ihe a ga-eme banyere mmechi gọọmentị Naịjiria mechiri gbata okeala ha.

E mere ka a mata na e nyeghi otu a e guzobere nke onyeisi ya bụ onyeisiala ndị Burkinafaso; Roch Marc Christian Kabore oge ha ga-eweghachi nchọpụta ha.

Ndị isi West Africa hibere otu a n’abalị ụbọchị ụka n’ọgbakọ 33rd African Union Summit nke e mere n’Addis Ababa, Ethiopia.

Cheta na onyeisiala Naịjiria bụ muhammadu Buhari mechiri okeala Naịjiria ka ọnwa Ọgọstụ gbara abalị iri abụọ (20th August) n’afọ 2019 iji belata ahịa iwu ndị mmadụ na-ebubata Naịjiria kacha osikapa na ngwa ọgụ dị ihe iche.

Ndị obodo mmechi okeala a metụtara akwaala akwa arịrị were na-ekwu na ya bụ iwu megidere iwu ECOWAS nakwa usoro ndị African Union.

Leave a Reply