Igbo News

Ebola alaala ndu n’iyi na DR Congo

Views

Ihe kariri mmadu otu puku na nari ise (1,500) anwụọla n’ihi Ebola nke na-erubeghi ọnwa iri o jiri bido na obodo Democratic Republic of Congo. Onye kwuru nke a bụ Minista na-ahụ maka ahụike n’ụbọchị Mọnde.

Na mbido ọnwa a, ọrịa a gburu mmadu abụọ na Uganda. Ndi ọnwụ a metụtara bụ ezinaụlọ gara njem na DR Congo.

E nyela mmadu ruru otu puku nari na puku iri anọ na otu (141,000) ọgwụ mgbochi n’akụkụ obodo DR Congo nke ọrịa a metụtara.

A na-enweta ọrịa Ebola site ọbara, mmiri si n’ahụ apụta nakwa na ụmụ ihe di iche iche onye na-arịa ọrịa metụrụ aka.

Ụdị ogbugbu ọrịa butere ba DR Congo bụ ụdị a na-ahụtụbegi. Ihe kpatara nke a bụ na ndi bi n’akụkụ obodo ọrịa na-egbu, na-enye ndi ụlọ ọgwụ biara inyere ha aka mmekpa ahụ. N’ụbọchị Mọnde, mmadu abụọ na-arịa Ebola gbara ụgbọala ndi ụlọ ọgwụ ọkụ. E merụkwara ụfọdụ ndi mmadu ahụ.

Leave a Reply