GossipsIgbo News

Aka akparala ụkọchukwu Lagos tụwara obere nwa ime

Views

Ndi uwe ojii nke Lagos Steeti akpochiela ụkọchukwu nke a na-akpọ Pope Paul maka idina na ịtụwa nwata dị afọ iri na ise ime n’ebe obibi ya nke dị na Igando na Lagos Steeti.

Bala Elkana bụ Public Relation Officer nke ndi uwe ojii kwuru na Sọnde na nne nwata a chọpụtara na nwa ya nwanyị di ime ka ọ kpọgara nwa ya ka ya na ụkọchukwu a biri. O kwuru na site n’ajụjụ ọnụ a gbara nwata nwanyị, a chọpụtara na ụkọchukwu bidoro idina nwata nwanyi kemgbe Januwari, 2018. Nwata nwanyị tụrụ ime n’ọnwa Juun, 2018.

Nne nwata bụ onye wegara ikpe a n’ụlọikpe ka nwa nwanyị muchara nwa n’April, 2019.

 

Leave a Reply