FeaturedIgbo News

E jidela nwanyi tinyere nwa odibo ya ose n’ike n’Anambra

Views

Ndi uwe ojii nke Anambra Steeti ejidela otu nwanyị a na-akpọ Charity Effiong maka ebubo itinye nwa odibo ya nwanyi ose n’ike ya n’ihi na nwata zuru puku naira iri abụọ na isii. Ihe a mere na Nzekwe nke dị na Kwata Jọnkshọn n’Ọka.

Nwata nwanyị dị afọ iri na abụọ bụ onye akụrụ ihe di egwu ebe a na-achọ ka o kwuo eziokwu maka ego furu. Nwata kwuru na onye nwe ya gbara ya ọtọ wee were ose cameroun tinye ya n’ike. Nwanyi a mechara chụpụ ya n’ụlọ mgbe o ji ọkara gafee elekere iri nke abalị. Ọ bụ onye na-agafe agafe kpọtara nwa odibo a. Nwa odibo kọwara otu onye nwe ya si emegbu ya.

Onye ode akwụkwọ nke Anambra steeti Child Protection Network, Hope Okoye, kwuru na ụdị omume a megidere iwu nke steeti Child Right Act nke 2004. O kwuru na itinye ose n’ike nwata nwanyị bụ ihe ga-ebute ihe na-adighi mma.

Nwanyi nwe nwa odibo a gakwuru ndi uwe ojii ka ihe a mechara, were kwuo na atọọrọ nwa ya. E jidere ya ma kpọrọ nwa odibo ahụ kpọgara nne na nna ya.

Leave a Reply