Igbo News

Dufil enyela ụmụaka onyinye maka agụmakwụkwọ

Views

Dufil Prima Foods, ụlọ ọrụ na-emepụta Indomie Instant Noodles, enyela puku nari naira nakwa ihe ndi ọzọ e ji agụ akwụkwọ. Ha nyere ndi Leadership Empowerment And Resource Network (LEARN) ihe ndi a.

Ndi Dufil Prima Foods kwuru na nke a bụ ụzọ ha si akwado agụmakwụkwọ nke bụ isi mmepe obodo.

Leadership Empowerment and Resource Network bụ ụlọ ọrụ na-ahụ maka ụmụaka; ndi dị site afọ itolu ruo iri na asaa.

Onye mepere LEARN bụ Odoziakụ Abimbola Fashola, nwunye gọvanọ Lagos Steeti gara aga.  LEARN bụ ebe a na-akụziri ụmụaka maka ọchịchị, aka ọrụ, ezi akparamagwa na ihe ndi ọzọ.

Mz. Tope Ashiwaju, onye ụlọ ọrụ Dufil na-ahụ maka ọha, kelere ndi LEARN maka mbo ha na-agba n’ịzụlite ụmụaka. Ọ gwakwara ụmụaka ndi a na-azụ ka ghara iji ihe na-amụta gwuo egwuregwu, kama ka ha jisie ike tinye ihe ha mụtara n’ọrụ.

Leave a Reply