EntertainmentFeaturedSports

Dangote na Otedola ekwela otu Super Eagles nkwa

Views

Ndi oke ọgaranya abụọ bụ Aliko Dangote na Femi Otedola ekwela otu Super Eagles nkwa inye ha puku dollar iri ise ($75,000) maka golu ọ bụla ha saran a nsọmpi ndi fọdụrụ na AFCON.

Dangote kwere ha nkwa puku dollar iri ise ($50,000) na golu ọ bụla ha sara n’asọmpi abụọ fodurunu ebe Otedola kwere nkwa ịtụkwasị ya puku dolla iri abụọ na ise ($25,000).

Ha kwere nkwa mgbe Super Eagles meriri ndi South Africa na quarter final n’asọmpi AFCON n’ụbọchị Wenezde; ebe ha nyere goolu abụọ nke ndi Bafana Bafana sara naanị otu. Dika ndi Nigeria Football Federation siri kwuo, ndi ọgaranya a kwere nkwa n’ụbọchị Tọzde.

Anyị ga-echetakwa na mgbe Super Eagles meriri Cameroun, otu onye mgbere ahịa a na-akpọ Husa Wells Okunbor kwere ndi Super Eagles nkwa puku dollar iri abụọ ma gọvanọ ndi Lagos steeti bụ Babajide Sanwo-Olu nyekwara ndi otu Super Eagles puku dollar ise.

Leave a Reply