FeaturedIgbo News

Corona Virus agbafuo n’ahụ onye Naịjirịa a sịrị bu ya

Views

Gọọmentị etiti emeela ka a mara n’ụbọchị Fraịde na ahụghịzikwa  Corona Virus n’ahụ onye Naịjirịa bụ onye nke abụọ e kwuru na o butere ya bụ ọrịa na Naịjira. Nke a mere a ga-eji hapụ ya ka o si n’ụlọọgwụ e bugara ya na Lagos laa n’oge na-adịghị anya. Onye mere ka a mara nke a bụ Minist na-ahụ maka ahụike na Naịjirịa, Dkt. Osagie Ehanire oge ọ na-ekwu maka ọnọdụ Corona Virus n’Abuja.

N’okwu nke ya, ” e nyochara mmadụ dị 42 n’ọnụọgụgụ bido na Jenuwarị 7 ruo Maachị 12 2020, ndị ha na onye Italy bubatara Corona Virus na Naịjirịa nwere mmetụta. Ndị a si Edo, Lagos, Kano, Abuja, Ogun, Yobe na Rivers.”

”N’ime mmadụ 42  e nyochara, ahụghị COVID 19 n’ahụ mmadụ 40; naanị mmadụ abụọ ka a hụrụ ya n’ahụ. Onwebeghikwanụ onye o gburu”

1 Comment

Leave a Reply