FeaturedIgbo News

Buhari nwere ike imachi otu Islamic Movement in Nigeria

Views

Onyeisiala Muhammadu Buhari na-eleba anya ma a ga-amachi otu Islamic Movement in Nigeria (IMN). Nke nwere ike ibia dika njọ ogbugbu nyere onye ọ bụla bụ onye otu ahụ. Dika ndi nta akụkọ kwuuru, onyeisiala ga-enye iwu a n’abali taa ma ọ bụ echi.

Onyeisi ala akpọọla nzukọ di oke mkpa, ya na ndi isi nchekwa niile n’abali Monde, mgbe ndi otu Shiites bke IMN nwere ngaghari iwe ha nke butere ọnwụ ọtụtụ mmadu. Ihe ekpebiri bụ na a ga-amachi otu IMN dika otu ọjọọ n’obodo.

Ndi nkwuchite ọnụ onyeisiala, Femi Adesina na Garba Shehu ekweghi aza ajụjụ ọ bụla maka ihe onyeisiala kpebiri maka mkpesa ndi otu IMN na-enye ka ahapụ onyeisi ha bụ El-Zakzaky bụ onye ndi soja nwụchiri n’ụbọchị iri na abụọ na ọnwa Disemba, 2015.

Leave a Reply